Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 22 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 9 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Jun 2027
Tiuzdee · Izu nke 1 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Ụbọchị nke atọ mgbe mmemme Atọ nʼIme Otu gasịrị
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Pọl, odibo Kraịst Jisọs, onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi ya na onye o kewapụtara ka o zisaa oziọma ya. 2Oziọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nʼoge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya nke e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ. 3Oziọma a metụtara Ọkpara ya, onye bụ nwa Devid site nʼọmụmụ nke anụ ahụ. 4Onye esitere na Mmụọ nke ịdị nsọ họpụta ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼike nke mbilite nʼọnwụ, bụ Kraịst Jisọs, Onyenwe anyị. 5Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara na ọrụ ị bụ onyeozi, ime ka ndị mba ọzọ nwee nrube isi nke okwukwe nʼetiti ha nʼihi aha ya. 6Tinyere unu onwe unu ndị ahụ a kpọrọ ka ha bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst. 7Ya bụ, unu ndị Chineke hụrụ nʼanya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 13Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata na atụọla m atụmatụ ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe (ma tutu ruo ugbu a e gbochiri m ịbịa), ka m nwee ike nweta mkpụrụ nʼetiti unu, dịka m nwere nʼetiti ndị mba ọzọ. 14Nʼihi na abụ m onye ji ụgwọ nye ndị Griik na ndị mba ọzọ, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu. 15Ya mere m ji dị njikere ikwusa oziọma nyekwa unu bụ ndị bi na Rom. 16Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik. 17Nʼihi na ọ bụ nʼoziọma ka e kpughere ezi omume Chineke, ezi omume nke na-esite nʼokwukwe ruo okwukwe. Dịka e siri dee ya, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”
Oziọma
25Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya. 5:1Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, 2o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị: 3“Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 4Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. 5Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. 6Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju. 7Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. 8Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya. 9Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. 10Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 11“Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. 12Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ. 13“Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Jun na kalenda nzukọ bụ 22 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike