Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 15 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Jun 2027

Tiuzdee · Izu nke 11 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 11 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

2Kọ 8:1–9

1Anyị chọrọ ime ka unu mara, ụmụnna m, ihe banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ niile dị na Masidonia. 2Nʼime ọnọdụ oke mkpagbu na ihe mwute, ha nwere ọṅụ dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, wezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ. 3Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta. 4Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka. 5Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha. 6Ya mere, anyị rịọrọ Taịtọs, onye malitere ọrụ ka ọ rụzuo ọrụ amara ahụ ruo nʼisi. 7Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a. 8Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa. 9Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 146:1–2, 5–9

1Toonu Onyenwe anyị. O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. 2Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ. 5Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya. 6Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 7Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, 8Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. 9Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma.

Oziọma

Mat 5:43–48

43“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya, ma kpọkwanụ ndị iro unu asị.’ 44Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere. 45Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume. 46Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a. 47Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ. 48Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike