Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 16 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Jun 2027

Wenezdee · Izu nke 11 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 11 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

2Kọ 9:6–11

6Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne. 7Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya. 8Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma. 9Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” 10Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba. 11Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 112:1–4, 9

1Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. 2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi. 3Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị, nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume. 9Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.

Oziọma

Mat 6:1–6, 16–18

1“Kpacharanụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu naanị ka ndị mmadụ hụ unu. Nʼihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọbụla site nʼaka Nna unu bi nʼeluigwe. 2“Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke. 3Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime. 4Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị. 5“Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke. 6Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu. 16“Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha. 17Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri, 18ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike