Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 15 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 2 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Jun 2027
Tiuzdee · Izu nke 7 nke Ista · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
St. Nicephorus the Confessor, Patriarch of Constantinople († 828)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
26Pọl kpọọrọ ndị ikom anọ ndị ahụ tinyere onwe ya, nʼụbọchị so ya mee ka ya na ha dị ọcha. Mgbe ahụ, ọ banyere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, maka ikwupụta ụbọchị ole mmemme ịdị ọcha ahụ ga-anọ tupu e mechaa ya, nakwa mgbe ịchụ aja nʼihi ha nʼotu nʼotu ga-abụ. 27Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ ma kpaliekwa ha. Ha jidere ya, 28na-eti mkpu, “Ndị ikom Izrel, nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị Griik nʼime ya.” 29(Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na Trofimọs onye Efesọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.) 30Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile. 31Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na Jerusalem niile nọ nʼọgbaaghara. 32Otu mgbe ahụ o duuru ụfọdụ ndịisi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nʼebe ha nọ. Mgbe ha hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe.
Oziọma
2Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a. 3Ha ga-eme ihe ndị a nʼihi na ha amaghị Nna maọbụ m. 4Ana m agwa unu ihe ndị a ka ọ ga-abụ na mgbe oge ga-eru, unu echeta na m gwara unu. Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ nʼihi na mụ na unu nọ mgbe ahụ. 5Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ma ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu jụrụ m, ‘Olee ebe ị na-aga?’ 6Ma nʼihi na m gwara unu ihe ndị a, obi unu ejupụtala na mwute. 7Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. 8Mgbe ọ bịara, ọ ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe, 9maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m; 10ma gbasara ezi omume, nʼihi na ana m alakwuru Nna, ebe unu na-apụghị ịhụ m ọzọ, 11maka ikpe, nʼihi na e kpeela onyeisi ụwa a ikpe. 12“Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a, unu agaghị anabatalị ha. 13Ma mgbe Mmụọ eziokwu ahụ bịara, ọ ga-eduba unu nʼeziokwu niile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya, kama ọ bụ ihe niile ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe niile gaje ịbịa.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Jun na kalenda nzukọ bụ 15 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike