Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 13 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Jun 2027

Sọnde · Izu nke 11 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 11 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Izk 17:22–24

22“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu. 23Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile. 24Nʼoge ahụ, osisi ọhịa niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ onye na-egbuda osisi niile dị elu, ma na-ewelikwa ndị dị nta elu. Na ọ bụ m na-eme ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, ma na-emekwa ka nke nwụrụ anwụ dịrị ndụ. “ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Aghakwaghị m ime ya.’ ”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 92:1–2, 12–15

1Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike. Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị, na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu, 2ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ, na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị, 12Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn, 13nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị, ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị. 14Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ, 15na-ekwupụta, “ Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi; ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”

Ihe ọgụgụ nke abụọ

2Kọ 5:6–10

6Nʼihi nke a, anyị nwere obi ike mgbe niile, nʼihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nʼihu na-adị ndụ nʼanụ ahụ a, anyị na Onyenwe anyị anọghị. 7Nʼihi ọ bụ okwukwe ka anyị ji adị ndụ ọ bụghị ihe anya hụrụ. 8Obi siri anyị ike. Ọ gaara amasị anyị ịhapụ ụlọ nke a anyị bi na ya, bụ ahụ anyị ma lakwuru Onyenwe anyị nʼebe obibi ya. 9Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ. 10Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ.

Oziọma

Mak 4:26–34

26Ọ sịkwara, “Alaeze Chineke yiri ihe dị otu a. Ọ dịka mgbe otu onye ghara mkpụrụ nʼala ubi. 27Ehihie na abalị, ma ọ nọ nʼụra ma o tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụte na-etokwa, ma ọ maghị ka o si na-eme. 28Ala ahụ nʼonwe ya na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Ọ na-epupụte na mbụ, too oko, emesịa isi ọka, nʼikpeazụ ọ mịkwara mkpụrụ kara aka nʼoko ya. 29Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, o na-eji mma iwe ihe ubi ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọrọkwa ogbe ọka laa, nʼihi na oge iwe ihe nʼubi eruola.” 30Ọzọkwa, ọ sịrị, “Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya? 31Ọ dị ka mkpụrụ mọstaadị, nke bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta nke a na-akụ nʼala. 32Ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-eto bukarịa ihe niile a kụrụ nʼubi, ọ na-enwe alaka dị ukwuu nke bụ na ụmụ anụ ufe nke eluigwe na-ezukwa ike nʼokpuru ya.” 33O jiri ọtụtụ ilu yiri ndị a gwa ha okwu dị ka ha pụrụ ịghọta. 34O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya naanị nọdụ, ọ na-akọwara ha ihe niile.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike