Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 8 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Jun 2027
Tiuzdee · Izu nke 10 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 10 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
18Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.” 19Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.” 20Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto. 21Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ. 22Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.
Abụ Ọma nzaghachi
129Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi. 130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. 131Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike. 132Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. 133Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m. 135Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile.
Oziọma
13“Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ. 14“Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo. 15Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè. 16Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike