Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 8 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 26 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Jun 2027
Tiuzdee · Izu nke 6 nke Ista · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Apostles of the Seventy Carpus and Alphæus (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
19Ha kpọbatara ya nʼebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Areopagọs, ebe ha nọ sị ya, “Anyị enwere ike ịmata ihe banyere ozizi ọhụrụ gị a? 20Ị na-ekwu ihe ndị na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịmata ihe ndị a nke ọma.” 21(Ndị Atens niile na ndị ala ọzọ bi nʼobodo ahụ, enweghị ohere ime ihe ọbụla, ọ gwụchaala ọrụ ikwu na ịnụ banyere ihe dị ọhụrụ.) 22Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe. 23Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu. 24“Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo. 25Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile. 26O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha. 27Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya. 28‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’
Oziọma
19Ya mere, ndị Farisii sịrịtara onwe ha, “Unu ahụla na o nweghị ihe unu pụrụ ime, leenụ ka ụwa niile na-eso ya.” 20Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ. 21Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.” 22Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs. 23Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto. 24Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ. 25Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. 26Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ. 27“Ugbu a, mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mgbu. Gịnịkwa ka m ga-ekwu, Nna, zọpụta m nʼawa nke a? Mba! Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa nʼoge awa a. 28Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.” 29Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.” 30Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu. 31Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a. 32Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.” 33O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ. 34Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?” 35Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga. 36Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Mee na kalenda nzukọ bụ 8 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike