Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 9 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Jun 2027

Wenezdee · Izu nke 10 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 10 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Efrem, Dikọn na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

2Kọ 3:4–11

4Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ. 5Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke. 6Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ. 7Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga, 8ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa? 9Ọ bụrụ na-enwere ebube nʼime ije ozi nke amamikpe, ije ozi nke ezi omume ga-adị ebube karịa ya. 10Nʼezie, ihe jupụtara nʼebube mgbe ochie enwekwaghị ebube ọbụla ugbu a, nʼihi na ebube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ekpuchiela ya. 11Ọ bụrụ na ihe na-agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 99:5–9

5Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu, feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; ọ dị nsọ. 6Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha. 7Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha. 8O Onyenwe anyị, Chineke anyị, ị zara ha; ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie, nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha. 9Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu; na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ, nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.

Oziọma

Mat 5:17–19

17“Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha. 18Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu. 19Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike