Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 2 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Jun 2027
Wenezdee · Izu nke 9 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 9 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ndị nsọ Maselinọs na Pita, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
2O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m. 3Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ. 4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. 5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. 6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. 7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. 8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.
Oziọma
18Ụfọdụ ndị Sadusii bụ ndị sịrị na mbilite nʼọnwụ adịghị bịakwutere ya jụọ ya sị, 19“Onye ozizi, Mosis nyere anyị iwu na ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye nwoke ahụ, mụta ụmụ nʼaha nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ. 20Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, nke mbụ lụrụ nwunye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ọbụla. 21Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa. 22Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha asaa mụtara nwa ọbụla, nʼikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara. 23Nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụtụchara ya?” 24Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke? 25Mgbe ha ga-esite nʼọnwụ bilie, ọlụlụ di na nwunye agaghị a dị; kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. 26Ma nʼokwu banyere ndị nwụrụ anwụ isite nʼọnwụ bilie, ọ bụ na unu agụtabeghị nʼakwụkwọ Mosis ebe e dere maka ọhịa ahụ na-ere ọkụ, na otu Chineke si gwa ya, Abụ m Chineke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. 27Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama nke ndị dị ndụ. Nʼebe ahụ ka unu dahiere nke ukwuu.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ndị nsọ Maselinọs na Pita, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike