Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 2 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 20 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Jun 2027

Wenezdee · Izu nke 5 nke Ista · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Njedebe nke etiti mmemme

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 13:13–24

13Pọl na ndị otu ya ji ụgbọ mmiri site na Pafọs garuo Pega nke dị nʼala Pamfilia. Nʼebe a ka Jọn hapụrụ ha laghachi Jerusalem. 14Site na Pega ha gara ruo Antiọk obodo nke dị na Pisidia. Nʼụbọchị izuike, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu nọdụ ala. 15Mgbe a gụpụtasịrị site nʼakwụkwọ iwu na nke ndị amụma, ndịisi ụlọ ekpere ahụ zigara ya ozi, sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ịgbaume nye anyị, biko kwuonụ ya.” 16Pọl guzoro ọtọ nʼetiti ha feere ha aka ya, sị, “Unu ndị Izrel na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị. 17Chineke nke Izrel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwu nʼoge ha nọ nʼobodo Ijipt. O ji ike aka ya dupụta ha site nʼala ahụ. 18Ọ nagidere ha iri afọ anọ nʼime ọzara. 19O bibiri mba asaa dị ukwuu nʼime ala Kenan nʼihi ha, nyekwa ndị ya obodo a ka ọ bụrụ nke ha. 20Nke a bụ ihe dị ka narị afọ anọ na iri afọ ise. “Mgbe nke a gasịrị, o nyere ha ndị ikpe dị iche iche ruo oge Samuel onye amụma. 21Mgbe ahụ ha rịọrọ ka enye ha eze, Chineke nyekwara ha Sọl, nwa Kish, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta, onye chịrị iri afọ anọ. 22Mgbe o wepụsịrị ya, o mere Devid ka ọ bụrụ eze ha. Ọ gbara ama banyere ya sị, ‘Achọtala m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka ọchịchọ obi m nke si dị. Ọ bụkwa onye ga-eme ihe niile m chọrọ ka o mee.’ 23“Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite. 24Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị.

Oziọma

Jọn 6:5–14

5Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?” 6Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme. 7Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.” 8Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara, 9“Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?” 10Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise. 11Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ. 12Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.” 13Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ. 14Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Mee na kalenda nzukọ bụ 2 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike