Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 1 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Jun 2027

Tiuzdee · Izu nke 9 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 9 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: uhie

Onye nsọ Jọstin, Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 112:1–2, 7–9

1Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. 2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi. 7Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ; obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi. 8Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla; nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri. 9Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.

Oziọma

Mak 12:13–17

13Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ site nʼotu ndị Farisii na ndị otu Herọd, ile ma ha ga-esite nʼokwu ọnụ ya jide ya. 14Ha bịakwutere ya, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye eziokwu, ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ, kama ị na-ezi ụzọ Chineke nʼụzọ eziokwu. O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza ka ọ bụ na o zighị ezi? 15Anyị kwesiri ịkwụ ya ka ọ bụ anyị ekwesighị?” Ma ebe ọ maara ihu abụọ ha, ya mere ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? Wetaranụ m otu mkpụrụ ego ka m lee ya anya.” 16Ha wepụtara otu mkpụrụ ego, Ọ sịrị, “Onye nwe onyinyo a? Aha onye ka e bikwasịrị nʼego a?” Ha zara sị, “Ọ bụ nke Siza.” 17Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe bụ nke ya, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke ya.” Ọsịsa ya jụkwara ha anya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike