Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 1 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 19 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Jun 2027
Tiuzdee · Izu nke 5 nke Ista · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyrs Patrick the Bishop of Prussa and the Priests Acacius, Menander, and Polyenus († c. 100)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
25Mgbe ha rụchara ọrụ ha, Banabas na Sọl si Jerusalem lọghachi. Ha kpọọrọ Jọn onye a na-akpọkwa Mak nʼije ha. 13:1Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl. 2Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.” 3Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha. 4Ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha gbadara Selusia, sitekwa ebe ahụ gbadaa Saiprọs. 5Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi. 6Mgbe ha gazuchara obodo niile ndị ahụ mmiri gbara gburugburu ruo Pafọs, ha zutere otu onye mgbaasị, onye Juu bụ onye amụma ụgha a na-akpọ Ba-Jisọs. 7Ya na otu onye ọchịchị obodo, aha ya bụ Sajiọs Pọlọs nọ. Ọ bụ nwoke nwere ọgụgụisi nʼebe ọ dị ukwuu, ọ kpọrọ Banabas na Sọl ka ha gwa ya okwu nke Chineke. 8Ma onye mgbaasị ahụ, onye aha ya bụkwa Elimas (nʼihi nke a bụ aha ya ma asụgharịa ya) malitere igbochi ha site nʼimegharị onyeisi ahụ anya ka ọ ghara ịnabata okwukwe ahụ. 9Ma Sọl, onye aha ya bụkwa Pọl, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, legidere ya anya 10sị, “Gị nwa ekwensu, jupụtara nʼaghụghọ na nʼihe ọjọọ dị iche iche. Gị onye iro nke ezi omume niile. Ọ bụ na i gaghị akwụsị imerụ ụzọ niile ziri ezi nke Onyenwe anyị? 11Nʼihi ya lee, iwe nke Onyenwe anyị ga-adakwasị gị. Ị ga-ekpụ ìsì nwa oge, ị gaghị enwe ike hụ ìhè nke anyanwụ.” Nʼotu oge ahụ, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Ọ malitere na-ebigharị aka, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya. 12Mgbe onyeisi ahụ hụrụ ihe mere, o kweere, nʼihi na o juru ya anya bụ ozizi nke okwu Onyenwe anyị.
Oziọma
51Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.” 52Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. 53Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?” 54Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m. 55Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya. 56Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.” 57Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?” 58Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.” 59Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Mee na kalenda nzukọ bụ 1 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike