Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 31 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 31 Mee 2027

Mọnde · Izu nke 9 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Nleta nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi

Mmemme · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Zef 3:14–18

ma ọ bụ: Rom 12:9–16

14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem. 15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. 16Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba. 17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.” 18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.

Abụ Ọma nzaghachi

Aịz 12:2–6

2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” 3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. 6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Oziọma

Luk 1:39–56

39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” 46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu 47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 50Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 51O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha. 52O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu. 53O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu. 54O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere. 55Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” 56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike