Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 20 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Mee 2027
Tọọzdee · Izu nke 7 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 7 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Benadin nke Siena, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. 2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị, 3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị. 6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Oziọma
41Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya. 42“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri. 43Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; 44ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 45Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; 46ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 47Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, 48ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 49A ga-eji ọkụ nụchaa onye ọbụla dị ka nnu. 50“Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ị ga-esi mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Benadin nke Siena, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike