Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 20 Mee

Kalenda Ọtọdọks · 7 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Mee 2027

Tọọzdee · Izu nke 3 nke Ista · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Commemoration of the Apparition of the Sign of the Precious Cross Over Jerusalem in 351 AD

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 8:26–39

26Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip sị, “Gaa na ndịda, nʼụzọ ọzara nke siri Jerusalem gawa Gaza, ụzọ ahụ bụ ụzọ ọzara.” 27O biliri gawa. Mgbe ahụ, otu onye Itiopia bụ onye onozi, bụrụkwa onyeisi ozi dị mkpa, onye na-eche akụ nke Kandis, eze nwanyị ndị Itiopia, gara Jerusalem ife Chineke. 28Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nʼụgbọala ya, nke ịnyịnya na-adọkpụgharị, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. 29Mmụọ Nsọ gwara Filip, “Gaa ụgbọ ahụ nso, sonyekwara ya.” 30Filip gara nso, nụkwa ka ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ sịrị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?” 31Ọ sịrị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nʼụgbọala ahụ, soro ya nọdụ nʼime ya. 32Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya. Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị, otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya. 33Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka. Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya? Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya.” 34Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?” 35Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs. 36Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Onozi ahụ sịrị, “Lee, nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?” 37Filip sịrị, “Ọ bụrụ na i ji obi gị niile kwere, e nwere ike ime gị baptizim.” Onozi ahụ sịrị, “Ekwere m na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke.” 38O kwuru ka a kwụsị ụgbọala ahụ. Mgbe ahụ, onozi ahụ na Filip wụdatara banye nʼime mmiri ebe Filip nọ mee ya baptizim. 39Mgbe ha sitere nʼime mmiri ahụ pụta, ngwangwa Mmụọ Onyenwe anyị sitere nʼebe ahụ wepụ Filip, onye onozi ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ; kama ọ gara nʼihu nʼije ya na-aṅụrịkwa ọṅụ.

Oziọma

Jọn 6:40–44

40Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.” 41Nʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị, “Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.” 42Ha sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị, ‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?” 43Jisọs zara sị ha, “Unu atamula nʼetiti onwe unu. 44O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Mee na kalenda nzukọ bụ 20 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike