Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 19 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Mee 2027

Wenezdee · Izu nke 7 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 7 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 119:165, 168, 171–172, 174–175

165Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ. 168Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile. 171Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile. 172Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. 174Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, iwu gị bụ ihe na-amasị m. 175Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume.

Oziọma

Mak 9:38–40

38Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.” 39Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m. 40Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike