Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 17 Mee

Kalenda Ọtọdọks · 4 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Mee 2027

Mọnde · Izu nke 3 nke Ista · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Virginmartyr Pelagia of Tarsus, in Asia Minor († c. 290)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 6:8–7:5, 47–60

8Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. 9Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka. 10Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu. 11Mgbe ahụ, ha ji ụzọ nzuzo kpalie ụfọdụ ndị ikom ka ha sị, “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwujọ Mosis na Chineke.” 12Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe. 13Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị. 14Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.” 15Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi. 7:1Onyeisi nchụaja sịrị ya, “Ị nụrụ ihe ndị a, ọ bụ eziokwu?” 2Ọ sịrị, “Ụmụnna m na ndị nna, geenụ m ntị. Chineke onye dị ebube gosiri nna nna anyị Ebraham onwe ya mgbe ọ nọ na Mesopotamịa, tupu ọ gaa biri na Haran. 3Ọ gwara ya, ‘Site nʼobodo gị na nʼetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nʼala m ga-egosi gị.’ 4“Ya mere, o sitere nʼobodo ndị Kaldịa pụọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, Chineke zitere ya nʼala a ebe unu bi ugbu a. 5O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa. 47Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ. 48“Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru, 49“ ‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru. 50Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile?’ 51“Unu ndị isiike! Ndị obi ha, na ntị ha kpọchiri akpọchi ịnụ ihe. Ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna nna unu ha mere. 52Ọ dị onye amụma ndị nna unu ha na-akpọgbughị? Ha gburu ọ bụladị ndị buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ezi omume ahụ, ma ugbu a unu bụ ndị raara ya nye ma gbukwaa ya. 53Unu bụ ndị natara iwu Chineke dịka e nyere ya site nʼaka ndị mmụọ ozi, ma unu edebeghị ya.” 54Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu. Ha tara ikikere eze nʼiwe na nʼọnụma nʼebe ọ nọ. 55Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke. 56Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.” 57Ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsịaka ha rụchie ntị ha. Ha niile gbara ọsọ gaa nụkwasị ya, 58dọkpụrụ ya pụọ nʼazụ obodo malite ịtụ ya nkume. Nʼoge a, ndị akaebe wụsara uwe ha nʼụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl. 59Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.” 60O gburu ikpere nʼala werekwa oke olu tie mkpu, “Onyenwe anyị, biko agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusiri nke a, ọ dara nʼala nwụọ.

Oziọma

Jọn 4:46–54

46Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm. 47Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ. 48Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.” 49Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.” 50Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa. 51Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma. 52Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.” 53Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere. 54Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Mee na kalenda nzukọ bụ 17 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike