Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 18 Mee

Kalenda Ọtọdọks · 5 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Mee 2027

Tiuzdee · Izu nke 3 nke Ista · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Great Martyr Irene of Thessalonica (1st-2nd C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 8:5–17

5Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst. 6Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ. 7Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ. 8Nʼihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nʼobodo ahụ. 9Ugbu a, kemgbe ọtụtụ oge gara aga, otu nwoke aha ya bụ Saimọn bụ onye mgbaasị. O jirila mgbaasị ya mee ọtụtụ ihe tụrụ ndị niile bi nʼobodo Sameria nʼanya. Ọ na-anyakwa isi na ya bụ onye dị ukwu. 10Onye ọbụla, ma onye ukwu ma onye nta, na-ege ya ntị na-asịkwa “Nwoke a bụ ike Chineke ahụ a na-akpọ Ike dị ukwuu.” 11Ha na-ege ya ntị oge niile nʼihi na ọ na-eji ike mgbaasị ya na-eme ihe juru ha anya. 12Ma mgbe ha kwenyere nʼoziọma Filip dịka ọ na-ekwusa ihe banyere oziọma alaeze Chineke na aha Jisọs Kraịst, e mere ha baptizim, ma nwoke ma nwanyị ha. 13Saimọn kwerekwara otu aka ahụ. Mgbe e mechara ya baptizim, o bidoro iso Filip na-agagharị nʼihi ihe ịrịbama na ọrụ ebube niile Filip rụrụ, tụrụ ya nʼanya nke ukwuu. 14Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu nke Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn. 15Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ. 16Nʼihi na Mmụọ Nsọ abịakwasịbeghị onye ọbụla nʼime ha, kama ihe e mere ha bụ baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs. 17Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ha aka nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ.

Oziọma

Jọn 6:27–33

27Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.” 28Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?” 29Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.” 30Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ? 31Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’” 32Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe. 33Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Mee na kalenda nzukọ bụ 18 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike