Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 15 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 2 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Mee 2027
Satọdee · Izu nke 2 nke Ista · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
St. Athanasius the Great, Patriarch of Alexandria († 373)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
21Mgbe ha nụrụ nke a, nʼisi ụtụtụ, ha banyere nʼụlọnsọ ukwu malite izi ihe. Ma mgbe onyeisi nchụaja na ndị soo ya bịarutere, ha kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin nke bụ ọgbakọ jikọtara ndị okenye Izrel niile. Ha zipụrụ ozi ka e site nʼụlọ mkpọrọ kpụta ha. 22Ma mgbe ndị ahụ ha zipụrụ ruru nʼụlọ mkpọrọ, ha ahụghị ndị ozi ahụ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ ndị ọgbakọ ahụ ihe ha hụrụ, 23“Anyị hụrụ ka a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ ahụ nke ọma, ndị nche guzokwa nʼọnụ ụzọ ya. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị ahụghị onye ọbụla nʼime ya.” 24Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị, ha na-eche ihe nke a ga-apụta. 25Nʼotu oge ahụ, otu onye gbabatara gwa ha, “Leenụ! Ndị ahụ unu tụbara nʼụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nʼime ụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe.” 26Ngwangwa, onyeisi agha na ndị agha ya gara nʼụlọnsọ ahụ jide ndị ozi ahụ ma kpụta ha, ma ha ejighị ike mee nke a nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume. 27Mgbe a kpụtara ha, e mere ka ha guzoro nʼihu ọgbakọ ndị Sanhedrin, onyeisi nchụaja jụrụ ha ajụjụ, 28sị, “Ọ bụ anyị adọghị unu aka na ntị ka unu kwụsị ikuzi ihe nʼaha a; ma unu emeela ka ozizi unu jupụta Jerusalem niile kpebiekwa ime ka ọbara nwoke a dịrị anyị nʼisi.” 29Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị, “Anyị ga-erubere Chineke isi ọ bụghị mmadụ. 30Chineke nna nna anyị a kpọlitela Jisọs site nʼọnwụ bụ onye ahụ unu gburu site nʼịkpọgide ya nʼelu osisi. 31Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie. 32Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.” 33Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbawara ha obi, ha chọọ igbu ha.
Oziọma
14Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.” 15Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya. 16Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri, 17ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha. 18Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe. 19Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha. 20Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.” 21Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga. 22Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ. 23Mgbe ahụ ụfọdụ ụgbọ mmiri si Tiberịas bịara kwụsị nso nso ebe ahụ ndị mmadụ nọ rie achịcha mgbe Onyenwe anyị nyechara ekele maka ya. 24Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs. 25Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?” 26Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ. 27Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Mee na kalenda nzukọ bụ 15 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike