Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 5 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 22 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Mee 2027
Wenezdee · Izu Ìhè · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke Izu Ìhè
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
22“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ. 23Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu. 24Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya. 25Devid kwuru banyere ya, “ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile. Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m. Agaghị m ama jijiji. 26Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ; anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya, 27nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure. 28I mere ka m mara ụzọ nke ndụ; ị ga-emekwa ka m jupụta nʼọṅụ nʼihu gị.’ 29“Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa. 30Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya. 31Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure. 32Ọ bụ Jisọs a ka Chineke mere ka ọ dị ndụ ọzọ. Anyị niile bụkwa ndị akaebe banyere ya. 33Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị. 34Ọ dịghị oge Devid jiri rigoro nʼeluigwe, ma ya onwe ya sịrị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m, 35ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’ 36“Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere nʼobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.”
Oziọma
35Nʼechi ya, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya guzoro nʼebe ahụ ọzọ. 36Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe, ọ sịrị, “Leenụ, Nwa Atụrụ Chineke.” 37Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs. 38Mgbe Jisọs tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ?” Ha sịrị ya, “Rabbi” (nke pụtara “Onye ozizi”), “olee ebe i bi?” 39Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede. 40Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita. 41Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst). 42Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita). 43Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.” 44Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita. 45Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.” 46Nataniel sịrị ya, “Ihe ọma ọbụla ọ pụrụ i si na Nazaret pụta?” Ma Filip sịrị ya, “Bịa ka ị hụrụ.” 47Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.” 48Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.” 49Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.” 50Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.” 51Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Epreel na kalenda nzukọ bụ 5 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike