Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 2 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Mee 2027

Sọnde · Izu nke 6 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 6 nke Oge Ista

Sọnde · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 10:25–26, 34–35, 44–48

25Mgbe Pita batara, Kọnelịọs zutere ya, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọrọ ya isi nʼala. 26Ma Pita selitara ya elu sị, “Bilie ọtọ, mụ onwe m bụkwa mmadụ.” 34Mgbe ahụ Pita meghere ọnụ ya sị, “Ugbu a, aghọtala m nʼezie na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya nʼihu. 35Kama nʼime mba ọbụla, onye ọbụla na-atụ egwu ya na onye na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata. 44Mgbe Pita nọ na-ekwu okwu, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị niile nụrụ okwu a. 45Nke a juru ndị e biri ugwu nʼetiti ndị kwere ekwe soro Pita bịa anya otu e siri mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ. 46Nʼihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu nʼasụsụ dị iche iche na-etokwa Chineke. Mgbe ahụ Pita jụrụ, 47“Ọ dị onye pụrụ igbochi anyị ime ndị a baptizim. Ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?” 48Nʼihi nke a, o nyere iwu ka e mee ha baptizim nʼaha Jisọs Kraịst. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 98:1–4

1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Jọn 4:7–10

7Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke. 8Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya. 9E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. 10Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.

Oziọma

Jọn 15:9–17

9“Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m. 10Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya. 11Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke. 12Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya. 13Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. 14Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu. 15Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m. 16Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m. 17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike