Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 3 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 20 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Mee 2027
Mọnde · Izu Ìhè · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke Izu Ìhè
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
12Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem. 13Mgbe ha batara nʼobodo, ha rigoro nʼime ụlọ ahụ dị nʼụlọ elu, ebe ha na-anọ. Ndị a bụ ndị nọ nʼụlọ ahụ: Pita, Jọn, Jemis na Andru, Filip na Tọmọs, Batalomi na Matiu, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas nwa Jemis. 14Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike nʼekpere. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna ya. 15Nʼoge ahụ, Pita bilitere nʼetiti ndị kwere ekwe ọnụọgụgụ ha dị ihe dị ka narị na iri abụọ, sị, 16“Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu nʼoge gara aga. 17Ọ bụ otu nʼime anyị. O nwere oke nʼime ọrụ a.” 21Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị, 22bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.” 23Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias. 24Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a. 25Ka ọ bụrụ onyeozi na onyendu nke ga-anọchi anya Judas onye nke hapụrụ ma gawa ebe o kwesiri ka ọ gaa.” 26Ha fere ha nza. Nza ahụ makwara Mataias, ha gụnyere ya dị ka otu nʼime ndị ozi iri na otu ahụ.
Oziọma
18Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya. 19Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ? 20O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.” 21Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?” Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.” “Ị bụ Onye amụma ahụ?” “Mba.” 22Ha sịrị ya, “Ị bụ onye? Nye anyị ọsịsa anyị ga-eweghachiri ndị zitere anyị. Gịnị ka i kwuru banyere onwe gị?” 23Ọ sịrị, dịka Aịzaya onye amụma kwuru, “Abụ m onye na-eti mkpu nʼime ọzara, ‘Meenụ ka ụzọ Onyenwe anyị guzozie.’ ” 24Ma ndị Farisii ahụ ezitere 25jụrụ ya, sị, “Gịnị mere i ji na-eme baptizim ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst maọbụ Ịlaịja, maọbụ onye amụma ahụ?” 26Jọn zara ha sị, “Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ dị otu onye nọ nʼetiti unu nke unu na-amaghị. 27Onye ahụ nke na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.” 28Ihe a mere na Betani nʼofe osimiri Jọdan bụ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Epreel na kalenda nzukọ bụ 3 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike