Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 13 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Maachị 2027

Satọdee · Izu nke 4 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 4 nke Lent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jer 11:18–20

18Ọ bụ Onyenwe anyị kpughere izuzu ọjọọ ha nye m; amatakwara m ihe ha na-ezube, nʼihi na o gosiri m ya nʼoge ahụ. 19Mụ onwe m dị ka nwa atụrụ dị nwayọọ nke e du na-aga ebe a ga-egbu ya. Ma aghọtaghị m na ọ bụ m ka ha zubererị nzube ọjọọ megide. Ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị bibie osisi a na mkpụrụ ya. Ka anyị site nʼala ndị dị ndụ wezuga ya, ka a hapụ ichetakwa aha ya ọzọ” 20Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya. Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 7:1–2, 8–11

1Abụ Shiggaion nke Devid, nke ọ bụkuru Onyenwe anyị banyere Kush, onye Benjamin. Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ, 2ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m. 8Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu. 9O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike. 10Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi. 11Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.

Oziọma

Jọn 7:40–53

40Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.” 41Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta? 42Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?” 43Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya. 44Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka. 45Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?” 46Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.” 47Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu? 48Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi? 49E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.” 50Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha, 51“Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?” 52Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.” 53Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike