Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 14 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Maachị 2027
Sọnde · Izu nke 5 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 5 nke Lent
Sọnde · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda. 32Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 33“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. 2Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. 10Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. 11Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. 12Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m. 13Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
7Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya. 8Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara. 9Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi.
Oziọma
20Ma ụfọdụ ndị Griik so nʼime ndị ahụ bịara ife ofufe nʼoge mmemme ahụ. 21Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.” 22Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs. 23Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto. 24Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ. 25Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. 26Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ. 27“Ugbu a, mkpụrụobi m jupụtara nʼihe mgbu. Gịnịkwa ka m ga-ekwu, Nna, zọpụta m nʼawa nke a? Mba! Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa nʼoge awa a. 28Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.” 29Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.” 30Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu. 31Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a. 32Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.” 33O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike