Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 13 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 28 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Maachị 2027

Satọdee · Izu chiiz · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke Izu chiiz

Ncheta ndị mọnk ezi omume nwụrụ anwụ

Izu chiiz

Ọ dịghị anụ; e kwere mmiri ara ehi, akwa na azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi (maka ndị nwụrụ anwụ)

Gal 5:22–6:2

22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.

Akwụkwọ ozi

Rom 14:19–23; 16:25–27

19Ka ihe na-agụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe ga-eweta udo, ya na ime ihe nʼụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu. 20Emebikwala ọrụ Chineke nʼihi nri; nri niile dị ọcha, ma o kwesighị ka onye ọbụla rie ihe ga-eme ka onye ọzọ sụọ ngọngọ. 21Ọ ga-akara gị mma ka ị hapụ iri anụ maọbụ ịṅụ mmanya ma ọ bụkwanụ ime ihe ọbụla ga-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ. 22Ya mere, ka okwukwe i nwere banyere ihe ndị a bụrụ nke dị nʼetiti gị na Chineke. Ngọzị na-adịrị onye ọbụla nke na-adịghị ama onwe ya ikpe site nʼihe ọ nabatara. 23Ma onye ọbụla na-eri ihe ọbụla site nʼobi abụọ bụ onye ikpe mara, nʼihi na ọ jighị okwukwe rie ya, nʼihi na ihe ọbụla a na-esiteghị nʼokwukwe mee bụ mmehie. 16:25Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị. 26Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe. 27Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen.

Oziọma (maka ndị nwụrụ anwụ)

Mat 11:27–30

27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”

Oziọma

Mat 6:1–13

1“Kpacharanụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu naanị ka ndị mmadụ hụ unu. Nʼihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọbụla site nʼaka Nna unu bi nʼeluigwe. 2“Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke. 3Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime. 4Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị. 5“Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke. 6Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu. 7Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na a ga-anụ ekpere ha nʼihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. 8Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu. 9“Sinụ otu a na-ekpe ekpere: “ ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe, ka e doo aha gị nsọ. 10Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nʼụwa, dịka e si eme ya nʼeluigwe. 11Nye anyị nri nke ụbọchị taa. 12Gbaghara anyị mmehie anyị, dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị. 13Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa, kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 13 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike