Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 6 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 21 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Maachị 2027
Satọdee · Izu ịhapụ anụ · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke Izu ịhapụ anụ
Satọdee ncheta ndị nwụrụ anwụ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi (maka ndị nwụrụ anwụ)
13Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya. 14Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ. 15Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ. 16Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. 17Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.
Akwụkwọ ozi
23Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma ọ bụghị ihe niile nwere ike inyere anyị aka. 24Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ. 25Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche. 26Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.” 27Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche. 28Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche.
Oziọma (maka ndị nwụrụ anwụ)
24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. 25Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. 26Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. 27O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ. 28“Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya 29ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe. 30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.
Oziọma
8Ọ sịrị, “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya,’ na-asịkwa na ‘Oge ahụ dị nso.’ Unu esokwala ha. 9Mgbe ọbụla unu nụrụ akụkọ agha dị iche iche na ọgbaaghara, ka ụjọ ghara ịtụ unu, ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mezuo, ma ọgwụgwụ oge erubeghị.” 25“A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa. 26Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji. 27Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii. 33Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga. 34“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya. 35Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa. 36Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 6 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike