Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 23 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 10 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Febrụwarị 2027

Tiuzdee · Izu nke Onye ọna ụtụ na Onye Farisii · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Hieromartyr Charalampus, Bishop of Magnesia in Thessaly, and the Martyrs Porphyrius, Baptus and 3 Women Martyrs († 202)

Izu na-enweghị obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Pt 2:9–22

9Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ. 10Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. 11Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi karịrị ha nʼịdị ike, nweekwa ume karịa, ma ha anaghị e kpegide ha ikpe nkwujọ nʼihu Onyenwe anyị. 12Lee ka ha si na-ekwulu ihe ndị ha aghọtaghị. Ha dị ka ụmụ anụ ọhịa, ndị nzuzu na-eme naanị ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha. Ndị a mụrụ naanị maka ijide ha ma bibiekwa ha. A ga-egbu ha otu e si egbu ụmụ anụ ọhịa ndị a. 13A ga-eji ntaramahụhụ kwụghachi ha ụgwọ ihe ọjọọ ha mere. Ihe na-atọ ha ụtọ bụ ịkpọ oriri na ọṅụṅụ nʼetiti ehihie. Ha bụ ihe ihere, bụrụkwa ndị na-ewetara unu ntụpọ ma ọ bụrụ na ha na-eso unu na-erikọta oriri. 14Anya ha jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, mmehie adịghị ejukwa ha afọ. Ha na-arafu ndị okwukwe ha na-esighị ike. Ha bụkwa ndị a maara aha ha nʼihi oke ọchịchọ. Nʼezie ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ. 15Ha esitela nʼezi ụzọ ahụ jehie, soro omume Belam nwa Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume nʼanya. 16Ma a baara ya mba maka ajọ omume ya, mgbe e mere ka ịnyịnya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu; gbochie ọrụ onyeisi na-adịghị mma nke onye amụma ahụ chọrọ ịrụ. 17Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị. 18Ha na-eji okwu efu na-enweghị isi, na agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ ha, na-arafu ndị sitere nʼetiti ndị na-ebi ndụ ọjọọ na-ekewapụ onwe ha. 19Ha na-ekwe ha nkwa inwere onwe ha, ma ha onwe ha bụ ohu nye ihe rere ure, nʼihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọbụla na-achị achị nʼime ya. 20Mgbe ha sitere nʼihe niile emerụrụ emerụ nke ụwa gbapụ, site na mmazu nke Onyenwe anyị, na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, bụrụ ndị atụhịrị na mmehie ọzọ, bụrụkwa ndị e meriri, ha ga-abụ ndị ọnọdụ ha ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ. 21Ọ gaara akara ha mma ma ọ bụrụ na ha amataghị ụzọ ezi omume, karịa na ha matara ya, mesịa gbakụta iwu ahụ dị nsọ nyere ha azụ. 22Ilu ndị a bụ eziokwu banyere ha sị, “Nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,” ya na, “Nne ezi a sachara ahụ laghachiri ọzọ ịtụrụ onwe ya nʼapịtị.”

Oziọma

Mak 13:14–23

14“Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị (onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu 15Onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ ya ghara ịrịdata maọbụ baa nʼime ụlọ ya iwepụta ihe ọbụla. 16Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya. 17Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ. 18Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi. 19Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. 20“Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ. 21Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 22Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. 23Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 23 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike