Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 24 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 11 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Febrụwarị 2027
Wenezdee · Izu nke Onye ọna ụtụ na Onye Farisii · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Blaise, Bishop of Sebaste († c. 316)
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ndị enyi m, nke a bụ akwụkwọ nke abụọ m na-edetara unu. Nʼime ha abụọ, ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ niile unu maara na itute uche unu banyere echiche zuruoke. 2Achọrọ m ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru mgbe ochie na iwu nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị nyere site na ndị ozi ya. 3Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ 4na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.” 5Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu. 6Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ. 7Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi. 8Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị. 9Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị. 10Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya. 11Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke, 12dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa. 13Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị. 14Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo. 15Chetakwanụ na ntachiobi Onyenwe anyị pụtara nzọpụta, dịka ezi nwanna anyị Pọl jiri amamihe Chineke nyere ya deere unu ihe banyere ya. 16O na-ede otu ihe ahụ nʼakwụkwọ ozi ya niile, na-ekwu ihe banyere ihe ndị a nʼime ha. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta nke ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe na-akọwa dịka ha si chepụta nʼobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere dịka ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ, si otu a wetara onwe ha ịla nʼiyi. 17Ya mere, ezi ndị enyi m, ebe unu matara nke a, nọrọnụ na nche ka a ghara isite na njehie ndị na-emebi iwu duhie unu, ime ka unu si nʼọnọdụ unu daa. 18Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Oziọma
24“Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya; 25kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada, ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’ 26“Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube. 27Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe. 28“Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso. 29Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ. 30Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 31Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 24 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike