Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 23 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Febrụwarị 2027

Tiuzdee · Izu nke 2 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 2 nke Lent

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo

Onye nsọ Polikap, Bishọp na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta nkenke

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 1:10, 16–20

10Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-achị Sọdọm; geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị, unu ndị Gọmọra. 16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma. 17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. 18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha. 19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. 20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 50:8–9, 16–17, 21, 23

8Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile. 9Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu, 16Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu? 17Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu. 21Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu. 23Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”

Oziọma

Mat 23:1–12

1Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ niile na ndị na-eso ụzọ ya sị, 2“Ndị ozizi iwu na ndị Farisii na-anọ nʼoche Mosis. 3Ya mere, meenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa unu. Ma unu esokwala omume ha. Nʼihi na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ. 4Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha. 5“Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe nta e tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu. 6Ha hụrụ ịnọ nʼisi oche nʼoge mmemme oriri ọbụla na ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nʼanya. 7Ọ na-amasị ha mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche nʼọma ahịa, ndị ọzọ a na-akpọkwa ha, ‘Onye ozizi.’ 8“Unu ekwela ka onye ọbụla kpọọ unu ‘Onye ozizi,’ nʼihi na unu nwere naanị otu Onye ozizi. Unu niile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu. 9Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe. 10Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nʼihi na ọ bụ naanị otu onyendu ka unu nwere, ya bụ Kraịst. 11Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. 12Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala. Ma onye ọbụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike