Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 22 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 9 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Febrụwarị 2027

Mọnde · Izu nke Onye ọna ụtụ na Onye Farisii · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Apodosis of the Meeting of the Lord

Izu na-enweghị obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Pt 1:20–2:9

20Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị. 21Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha. 2:1Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi. 2Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ. 3Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra. 4Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ. 5Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ. 6Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke; 7ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere 8(nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ). 9Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ.

Oziọma

Mak 13:9–13

9“Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha. 10Aghaghị ibu ụzọ kwusaa oziọma a nye mba niile. 11Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu. 12“Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya. Nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha. 13Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m, ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 22 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike