Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 21 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Febrụwarị 2027
Sọnde · Izu nke 2 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 2 nke Lent
Sọnde · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.” 2Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.” 9Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ. 10Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke. 11Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.” 12Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.” 13Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke. 15Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ, 16sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja, 17aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha. 18Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”
Abụ Ọma nzaghachi
10Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,” 15Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị. 16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. 17Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere, 19nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị, nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
31Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị? 32Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya? 33Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume. 34Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ.
Oziọma
2Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha. 3Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha. 4Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu. 5Pita gwara Jisọs sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nʼebe a. Ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu a bụrụ nke Mosis, nke ọzọkwa a bụrụ nke Ịlaịja.” 6(Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.) 7Mgbe ahụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Geenụ ya ntị.” 8Na mberede, mgbe ha lere anya gburugburu, ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa naanị Jisọs. 9Mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe ha hụrụ, tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie. 10Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Pita Damian, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike