Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 21 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 8 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Febrụwarị 2027
Sọnde · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke Onye ọna ụtụ na Onye Farisii
Mmalite Triodion nke Lent
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 5
12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara. 13Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem. 14Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere. 15Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije. 16Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya. 17Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha. 18Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?” 19Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile. 20Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe. 21Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere. 22Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a. 23Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ. 24Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.” 25Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru. 26Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?” 27Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile. 28Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya. 29Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha. 30Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha. 31Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ. 32Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?” 33Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe, 34na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.” 35Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.
Akwụkwọ ozi
10Ma ugbu a, ị maara ihe niile banyere ozizi m, na omume m, na ebumnuche m, na okwukwe m na ntachiobi m, na ịhụnanya m, na ndidi m, 11na mkpagbu m na ahụhụ niile nke dakwasịrị m nʼAntiọk, na Aikoniọm, na Listra. Ị maara ụdị mkpagbu dị iche iche m gabigara. Ma Onyenwe anyị napụtara m site nʼime ha niile. 12Nʼezie, ndị niile chọrọ ibi ndụ ịsọpụrụ Chineke nʼime Kraịst Jisọs ga-agabiga mkpagbu. 13Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie. 14Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nʼihe ịmụtara na ihe i kwenyesịrị ike na ya, ebe ị maara onye i si nʼaka ya mụta ha. 15Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site nʼokwukwe i nwere nʼime Kraịst Jisọs.
Oziọma
10“Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ. 11Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a. 12Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’ 13“Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’ 14“Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 21 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike