Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 20 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 7 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Febrụwarị 2027
Satọdee · Izu nke 38 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Meeting of the Lord
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
11Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi: Ọ bụrụ na anyị esoro ya nwụọ, anyị ga-esokwa ya dị ndụ. 12Ọ bụrụ na anyị anagide, anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị. Ọ bụrụ na anyị ajụ ya, ọ ga-ajụkwa anyị. 13Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe, ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi, nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya. 14Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi. 15Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma. 16Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa. 17Ozizi ha ga-agbasa dị ka nsị, Haimeniọs na Filetus soo na ndị dị otu a. 18Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, na-asị na oge mbilite nʼọnwụ agafeela. Site nʼokwu ha, ha na-ekpu okwukwe mmadụ ụfọdụ ihu nʼala. 19Ma ntọala Chineke hiwere na-eguzosi ike. Nʼelu ya ka eji ihe e dere kaa akara: “Onyenwe anyị maara ndị bụ ndị nke ya,” ya na, “Ka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraịst kwụsị ibi ndụ ajọ omume.”
Oziọma
2ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ. 3Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’ 4“Na mmalite, ọ chọghị, ma nʼikpeazụ, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ. 5Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’ ” 6Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu. 7Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka? 8Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 20 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike