Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 5 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Febrụwarị 2027
Fraịdee · Izu nke 4 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 4 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: uhie
Onye nsọ Agata, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide. 2Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị. 3Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu. 4Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe. 5Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.” 6Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” 7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha. 8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. 5Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. 8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ. 9Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m.
Oziọma
14Eze Herọd nụrụ akụkọ banyere ya, nʼihi na aha Jisọs aghọọla okwu a kpụ nʼọnụ. Ụfọdụ na-asị, na ọ bụ “Jọn omee baptizim; na e meela ka o site na ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa nke a mere ka ike ọrụ ebube ji dị nʼime ya.” 15Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ Ịlaịja.” Ma ndị ọzọkwa kwuru na ọ bụ onye amụma dị ka otu nʼime ndị amụma mgbe ochie. 16Ma mgbe Herọd nụrụ nke a, ọ sịrị, “Jọn onye ahụ m bipụrụ isi, emeela ka ọ site nʼọnwụ bilie!” 17Nʼihi na Herọd nʼonwe ya nyererị iwu ka e jide Jọn kee ya agbụ tụba ya nʼụlọ mkpọrọ. O mere nke a nʼihi Herodịas bụrịị nwunye Filip nwanne ya, onye ọ kpọrọ dịka nwunye ya. 18Nʼihi na Jọn gwara Herọd sị, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ nwunye nwanne gị nwoke.” 19Nʼihi ya Herodịas bu iro nʼobi megide Jọn na-achọkwa ụzọ igbu ya, mana ọ pụghị ime nke a, 20nʼihi na Herọd na-atụ egwu ma na-echekwa Jọn, ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ. Mgbe ọ nụrụ okwu ya, o nweghị udo nʼobi ma ige ya ntị na-amasị ya. 21Nʼikpeazụ, ohere bịara mgbe Herọd kpọrọ oriri nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya nye ndị ọkwa ha dị elu nʼokpuru ọchịchị ya, ndịisi ndị ọchịagha na ndị bụ ndị ndu nʼobodo Galili. 22Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.” 23O kwere ya nkwa ṅụọkwa iyi sị, “Ihe ọbụla ị rịọrọ m aga m enye gị, ọ bụladị ọkara alaeze m.” 24Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya sị, “Isi Jọn omee baptizim.” 25Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim.” 26O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya. 27Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ, 28tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya. 29Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Agata, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike