Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 5 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 23 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Febrụwarị 2027
Fraịdee · Izu nke 36 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Clement, Bishop of Ancyra, and Martyr Agathangelus († c. 312)
Ụbọchị obubu ọnụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu. 2Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, 3ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,” 4ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe? 5Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya? 6Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe? 7Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu? 8Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi. 9Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu. 10Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara. 11Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu. 12Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha. 13Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya.
Oziọma
23Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze Chineke.” 24Okwu ya tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya, ma Jisọs gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị, ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ ịbanye nʼalaeze Chineke. 25Ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 26Okwu a jubigara ha anya oke. Ha jụrịtara ibe ha sị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 27Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.” 28Pita malitere ịgwa ya sị, “Anyị ahapụla ihe niile soro gị!” 29Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a, 30nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ. 31Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.” 32Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 5 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike