Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 4 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Febrụwarị 2027

Tọọzdee · Izu nke 4 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 4 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 12:18–19, 21–24

18Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe, 19na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha. 21Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.” 22Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ. 23Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke. 24Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 48:1–3, 8–10

1Otu Abụ. Abụ Ọma nke ụmụ Kora. Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya. 2Ọ mara mma nʼịdị elu ya, bụkwa ọṅụ elu ụwa niile. Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu, dịka ebe kachasị elu nke Zafọn. 3Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike. 8Dịka anyị nụrụ, otu a ka anyị hụrụ, nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nʼime obodo Chineke anyị: Chineke na-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Sela 9O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ. 10O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume.

Oziọma

Mak 6:7–13

7Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha. 8Ndị a bụ iwu o nyere: “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, karịkwa mkpanaka. Unu ewela achịcha, maọbụ akpa, unu etinyela ego ọbụla nʼime belịt unu. 9Yirinụ akpụkpọụkwụ unu, unu eyikwala karịa otu uwe. 10Mgbe ọbụla unu banyere nʼụlọ ọbụla, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ. 11Ma ọ bụrụ na obodo ọbụla anabataghị unu maọbụ egeghị unu ntị, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.” 12Ha pụrụ kwusara ndị mmadụ ka ha chegharịa. 13Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, teekwa ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike mmanụ, gwọọ ha.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike