Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 3 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Febrụwarị 2027

Wenezdee · Izu nke 4 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 4 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Ansgar, Bishọp · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Blez, Bishọp na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 12:4–7, 11–15

4Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu. 5Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ, “Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba. 6Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.” 7Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. 11Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya. 12Ya mere, setịpụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzosie ike nʼụkwụ gị ahụ na-ama jijiji. 13Debenụ ụkwụ unu nʼụzọ ziri ezi, ka ụkwụ na-adịghị ike ghara ịda ngwụrọ, kama ka o nwe ọgwụgwọ. 14Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị. 15Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya merụọ ọtụtụ mmadụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 103:1–2, 13–14, 17–18

1Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. 2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile, 13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, 14nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja. 17Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha, 18nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.

Oziọma

Mak 6:1–6

1Ọ sitere nʼebe ahụ pụọ laghachi nʼobodo nke a mụrụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa. 2Nʼụbọchị izuike, ọ banyere nʼụlọ ekpere bido izi ihe. Ozizi ya juru ọtụtụ ndị gere ya ntị anya. Ha kwuru sị, “Ebee ka nwoke si mụta ihe ndị a niile? Gịnịkwa bụ amamihe nke a e nyere ya? Lekwa ọrụ ebube nke a ọ rụrụ? 3Onye a ọ bụghị onye kapinta ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef, Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ. 4Ma Jisọs zara ha sị, “Onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọbụla nʼobodo a mụrụ ya, na nʼetiti ndị ikwu ya na nʼezinaụlọ o siri pụta.” 5Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha. 6Enweghị okwukwe ha juru ya anya. O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike