Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 31 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 18 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 31 Jenụwarị 2027

Sọnde · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 35 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 2

Mak 16:1–8

1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ. 2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ. 3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” 4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ. 5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu. 6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya. 7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ” 8Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.

Akwụkwọ ozi

Kọl 3:12–16

12Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi. 13Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu. 14Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu. 15Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele. 16Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Atanasiọs na Onye nsọ Sirịl)

Hib 13:7–16

7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha. 8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 9Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya. 10Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya. 11Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu. 12Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ. 13Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri. 14Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa. 15Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya. 16Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.

Oziọma

Luk 18:18–27

18Otu onye ọchịchị jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi, ọ bụ gịnị ka m ga-eme keta ndụ ebighị ebi.” 19Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke. 20Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị. ” 21Ọ sịrị, “Edebezuchaala m iwu ndị a niile site na mgbe m bụ nwata.” 22Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.” 23Mgbe ọ nụrụ nke a, o wutere ya nke ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye nwere ọtụtụ akụ. 24Jisọs lere ya anya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe siri ike bụ ndị ọgaranya ịba nʼalaeze Chineke. 25Nʼezie, ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 26Ndị nụrụ ya sịrị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 27Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.”

Oziọma (maka Onye nsọ Atanasiọs na Onye nsọ Sirịl)

Mat 5:14–19

14“Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo. 15Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè. 16Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe. 17“Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha. 18Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu. 19Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 31 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike