Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 30 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 17 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Jenụwarị 2027
Satọdee · Izu nke 35 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Venerable and Godbearing Father Anthony the Great († 356)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Antoni)
17Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru. 18Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile. 19Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ. 20Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, 21mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Oziọma (maka Onye nsọ Antoni)
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 30 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike