Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 29 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Jenụwarị 2027
Fraịdee · Izu nke 3 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 3 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
32Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara. 33Mgbe ụfọdụ, a kparịrị unu nʼihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nʼoge ọzọ, unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso. 34Unu were obi ebere soro ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ taa ahụhụ, unu jikwa ọṅụ nabata ya mgbe a nakọrọchara unu ihe niile unu nwere, nʼihi na unu onwe unu matara na unu nwere ihe ka mma, nke na-anọgide. 35Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. 36Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa. 37Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.” 38Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.” 39Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.
Abụ Ọma nzaghachi
3Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. 4Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. 5Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a: 6Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie. 23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; 24ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya. 39Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu. 40Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.
Oziọma
26Ọ sịkwara, “Alaeze Chineke yiri ihe dị otu a. Ọ dịka mgbe otu onye ghara mkpụrụ nʼala ubi. 27Ehihie na abalị, ma ọ nọ nʼụra ma o tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụte na-etokwa, ma ọ maghị ka o si na-eme. 28Ala ahụ nʼonwe ya na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Ọ na-epupụte na mbụ, too oko, emesịa isi ọka, nʼikpeazụ ọ mịkwara mkpụrụ kara aka nʼoko ya. 29Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, o na-eji mma iwe ihe ubi ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọrọkwa ogbe ọka laa, nʼihi na oge iwe ihe nʼubi eruola.” 30Ọzọkwa, ọ sịrị, “Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya? 31Ọ dị ka mkpụrụ mọstaadị, nke bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta nke a na-akụ nʼala. 32Ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-eto bukarịa ihe niile a kụrụ nʼubi, ọ na-enwe alaka dị ukwuu nke bụ na ụmụ anụ ufe nke eluigwe na-ezukwa ike nʼokpuru ya.” 33O jiri ọtụtụ ilu yiri ndị a gwa ha okwu dị ka ha pụrụ ịghọta. 34O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya naanị nọdụ, ọ na-akọwara ha ihe niile.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike