Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 30 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 30 Jenụwarị 2027
Satọdee · Izu nke 3 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 3 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ugbu a, okwukwe bụ inwe obi ike banyere ihe ndị a na-ele anya ha na inwe owuweanya banyere ihe a na-ahụbeghị anya. 2Nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka e ji gbaara ndị ochie ama. 8Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga. 9Okwukwe ka o jiri biri dịka ọbịa nʼala ahụ e kwere ya na nkwa, na-ebi nʼụlọ ikwu, ya na Aịzik na Jekọb, bụ ndị e kwere ya na ha otu nkwa ahụ. 10Nʼihi na ọ na-ele anya ala ahụ nke nwere ntọala, nke onye tụrụ atụmatụ ya ma wuokwa ya bụ Chineke. 11Site nʼokwukwe ọ natara ike ọmụmụ. Ọ bụ ezie na ọ gafeela oge ịmụta nwa, ọ bụladị Sera nʼonwe ya bụ nwanyị aga, nʼihi na ọ gụrụ onye ahụ kwere ya nkwa dị ka onye kwesiri ntụkwasị obi. 12Ya mere site nʼotu onye a, onye a gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ ka e si nweta ụmụ ndị ọnụọgụgụ ha dị ka kpakpando dị na mbara eluigwe, dị ka aja dị nʼakụkụ osimiri. 13Ndị a niile nwere okwukwe nwụrụ na-anataghị nkwa ahụ, ma site nʼebe dị anya ha hụrụ ma nabatakwa nkwa ndị a. Ha kwupụtakwara na ha bụ ndị ọbịa na ndị mba ọzọ nʼụwa. 14Ndị na-ekwu otu a na-ezipụta na ha na-ele anya obodo nke aka ha. 15Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ. 16Ma otu ọ dị, ha na-elesi anya ike maka obodo ahụ ka mma, bụ nke dị nʼeluigwe. Ya mere, ọ dịghị eme Chineke ihere ka a kpọ ya Chineke ha, nʼihi na o dozielara ha ebe obibi. 17Site nʼokwukwe Ebraham ji Aịzik chụọ aja mgbe a nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere nkwa, dị njikere iji otu nwa ahụ o nwere chụọ aja, 18ọ bụ ezie na Chineke kwuru maka ya, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.” 19Ebraham chere na Chineke pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie, dịka ihe ịma atụ otu ahụ ka o mekwara, nʼihi na ọ nataghachikwara ya.
Abụ Ọma nzaghachi
69O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid. 70(Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ). 71Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị. 72O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ. 73Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa: 74Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu. 75Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Oziọma
35Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.” 36Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya. 37Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. 38Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?” 39Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii. 40Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?” 41Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike