Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 26 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 13 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Jenụwarị 2027
Tiuzdee · Izu nke 35 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Theophany
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
8Site na nke a, Mmụọ Nsọ na-egosi na ụzọ e si abanye nʼEbe Kachasị Nsọ ahụ bụ ihe na a ka apụtabeghị ihe, ebe ọ bụ na ụlọ ikwu nke mbụ ahụ ka na-eguzo. 9Nke a bụ ihe ilu banyere oge ugbu a. Site na nhazi nke a, onyinye na aja niile a na-achụ enweghị ike ime ka akọnuche onye na-efe ofufe zuo oke. 10Kama ha bụ naanị usoro iwu metụtara ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na ụdị baptizim dị iche iche nke anụ ahụ, bụ nke e nyere ka a na-eme ya ruo mgbe a ga-edozigharị ihe niile. 15Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ. 16Ọ bụrụ na mmadụ ekee ekpe mgbe ọ nọ ndụ, a na-ebu ụzọ achọpụta ma onye kere ekpe ahụ ọ nwụọla. 17Ekpe na-amalite ịdị ire mgbe onye kere ekpe ahụ nwụrụ, nʼihi na ihe mmadụ kere nʼekpe anaghị adị ire mgbe onye kere ya ka dị ndụ. 18Ọ bụ nke a mere ọ bụladị ọgbụgba ndụ ochie ahụ jiri bụrụ ihe na-adịghị ire ruokwa mgbe ọbara batara na ya. 19Mgbe Mosis kwupụtachara ndị mmadụ iwu ahụ, o weere ọbara ụmụ ehi na ewu, ya na mmiri, ogbo uhie na hisọp fesaa nʼakwụkwọ iwu ahụ nakwa nʼelu mmadụ niile. 20Na-ekwu, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu iwu.” 21Nʼotu aka ahụ, o fesakwara ọbara ahụ nʼelu ụlọ ikwu na nʼelu ihe niile dị nʼụlọ ikwu, bụ ihe niile e ji efe ofufe. 22Nʼikwu eziokwu, dịka iwu si dị, ọ dịghị ihe ọbụla nke a na-adịghị eji ọbara edo ọcha. Ọ bụrụ na a wụsịghị ọbara, mgbaghara mmehie adịghị. 23O kwesiri ka e si otu a mee ka ihe ndị a yiri ihe ndị dị nʼeluigwe dị ọcha, ma ihe ndị dị nʼeluigwe nʼonwe ha kwesiri ka e nye ha aja dị mma karịa.
Oziọma
22Mgbe ha ruru Betsaida, ụfọdụ mmadụ kpọtaara ya otu onye ìsì rịọọ ya ka o metụ ya aka, 23Ọ duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, ọ gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. Ọ jụrụ ya sị, “Ị na-ahụ ihe ọbụla?” 24Nwoke ahụ leliri anya elu ma sị, “Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha dị ka osisi na-agagharị agagharị.” 25Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara ya aka nʼanya, mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe niile nke ọma. 26Ọ zilagara ya ụlọ ya sị ya, “Abanyekwala nʼime obodo.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 26 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike