Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 28 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 15 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Jenụwarị 2027
Tọọzdee · Izu nke 35 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Paul of Thebes († 341)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
35Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. 36Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa. 37Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.” 38Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.” 39Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara. 11:1Ugbu a, okwukwe bụ inwe obi ike banyere ihe ndị a na-ele anya ha na inwe owuweanya banyere ihe a na-ahụbeghị anya. 2Nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka e ji gbaara ndị ochie ama. 3Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya. 4Ebel sitere nʼokwukwe chụọ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke Ken chụrụ; nke e si na ya gụnye ya nʼonye ezi omume. Chineke kwuru okwu banyere onyinye ya. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na ọ nwụọlarị ma ọ ka na-ekwu okwu site nʼokwukwe. 5E sitere nʼokwukwe kupu Enọk nke pụtara na ọ nwụghị anwụ, a hụkwaghị ya ọzọ nʼihi na Chineke akpọrọla ya. Ma tupu e kuru ya, e mere ka anyị mara na ọ mere ihe masịrị Chineke. 6Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ. 7Site nʼokwukwe, Noa, onye nke a dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gere ntị ma ruo ụgbọ mmiri maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya. Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe, ma bụrụ onye nketa nke ezi omume sitere nʼokwukwe.
Oziọma
10Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara. 11Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?” 12Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, na-emekwa ka ihe dị ka ọ dị na mbụ. Ma gịnị mere e jiri dee na Nwa nke Mmadụ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ? 13Ka m gwa unu, Ịlaịja abịalarị. Ma ha mesokwara ya mmeso otu ha chọrọ dị ka e dere banyere ya.” 14Mgbe ha bịarutere nʼebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ ka ha gbara ha gburugburu, hụkwa ụfọdụ ndị ozizi iwu ka ha na ha na-arụrịta ụka. 15Ngwangwa, mmadụ ahụ niile hụrụ ya, ụdịdị ya juru ha anya. Ha gbaara ọsọ gaa kelee ya. 16Ọ jụrụ ha sị, “Unu na ha ọ na-arụrịta ụka banyere gịnị?”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 28 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike