Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 25 Jenụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 12 Jenụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Jenụwarị 2027
Mọnde · Izu nke 35 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Theophany
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
7Ọ bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, ọ garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ. 8Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe ọ sịrị, “Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda. 9Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m. Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ, ka Onyenwe anyị kwupụtara. 10Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel, mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m etinye iwu m nʼime uche ha, dekwasị ya nʼobi ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 11Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. 12Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.” 13Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ọ pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.
Oziọma
11Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya. 12Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.” 13Ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ banyekwa nʼụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ. 14Ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Ọ bụ naanị otu ogbe achịcha fọdụụrụ ha nʼime ụgbọ. 15Ọ dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya. Lepụnụ anya maka ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke Herọd.” 16Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụ nʼihi na anyị enweghị achịcha.” 17Mgbe Jisọs ghọtara isi mkparịta ụka ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu maka enweghị achịcha? Ọ pụtara na unu adịghị ahụ maọbụ aghọta? Obi unu o siri ike? 18Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta? 19Mgbe m ji ogbe achịcha ise zụọ puku mmadụ ise, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.” 20“Mgbe m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.” 21Ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-enweghị nghọta?”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 25 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike