Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 22 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 22 Jenụwarị 2027

Fraịdee · Izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Vinsent, Dikọn na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 8:6–13

6Ma otu ọ dị, ọ natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka ọ dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa. 7Ọ bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, ọ garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ. 8Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe ọ sịrị, “Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda. 9Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m. Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ, ka Onyenwe anyị kwupụtara. 10Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel, mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m etinye iwu m nʼime uche ha, dekwasị ya nʼobi ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 11Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. 12Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.” 13Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ọ pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 85:7, 9–13

7O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide, nyekwa anyị nzọpụta gị. 9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị. 10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ. 11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya. 12Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya. 13Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.

Oziọma

Mak 3:13–19

13Ọ rigooro nʼelu ugwu ma kpọrọ ndị ọ chọrọ nye onwe ya. Ha bịakwutekwara ya. 14Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ ndị ya na ha ga-anọ, mee ha ndị ozi. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa oziọma, 15nakwa ndị ga-enwe ikike ịchụpụ mmụọ ọjọọ. 16Ndị a bụ mmadụ iri na abụọ ndị ọ họpụtara. Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita). 17Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya (ndị ọ gụgharịrị aha Boanajis, nke pụtara “ụmụ egbe eluigwe”), 18Andru, Filip, Batalomi, Matiu, Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Tadiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt, 19na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike