Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 21 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Jenụwarị 2027

Tọọzdee · Izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: uhie

Onye nsọ Agnes, Nwaagbọghọ na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 7:25–8:6

25Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha. 26Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe. 27Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja. 28Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi. 8:1Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe. 2Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya. 3A họpụtara onyeisi nchụaja ọbụla ka ọ na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nʼihi nke a, o kwesikwara ka ọ nwee ihe ọ ga-eji na-achụ aja. 4A sịkwarị na ọ nọ nʼụwa, o garaghị a bụ onye nchụaja nʼihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro iwu si dị. 5Ha na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ nke bụ oyiyi na onyinyo banyere ihe nke dị nʼeluigwe. Ọ bụ nke a mere e ji dọọ Mosis aka na ntị mgbe ọ na-akwado iwu ụlọ ikwu ahụ, “Lezie anya hụ na i mere ihe niile nʼusoro dị ka e si gosiri gị nʼelu ugwu.” 6Ma otu ọ dị, ọ natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka ọ dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 40:6–9, 16

6Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.” 9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m. 16Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “ Onyenwe anyị dị ukwuu.”

Oziọma

Mak 3:7–12

7Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nʼebe ahụ pụọ gaa nọdụ nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ ndị sitere na Galili sooro ya. 8Mgbe ha nụrụ ihe niile ọ na-eme, ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya site na Judịa, na Jerusalem, na Idumia na obodo ndị dị nʼofe Jọdan, na gburugburu Taịa na Saịdọn. 9Nʼihi ịdị ukwuu nke igwe mmadụ ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha debere ya ụgbọ mmiri nta nso ka ọ banye, iji gbochie igwe mmadụ ahụ ịkpagbu ya. 10Nʼihi na ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa, nke mere na ndị bu ọrịa dị iche iche na-agbalịsị ike ịmetụ ya aka. 11Mgbe ọbụla kwa ndị mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ha hụrụ ya, ha na-ada nʼala nʼihu ya na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!” 12Ma ọ na-enyesi ha iwu ike ka ha hapụ ịkọwa onye ọ bụ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike