Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 21 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 8 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Jenụwarị 2027

Tọọzdee · Izu nke 34 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Theophany

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Hib 7:1–6

1Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya. 2Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.” 3O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. 4Leenụ otu o siri bụrụ onye dị ukwuu, ọ bụladị Ebraham bụ nna nna anyị nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼihe ọ kwatara nʼagha! 5Ma otu ọ dị, iwu kwadoro ka ụmụ Livayị bụ ndị ghọrọ ndị nchụaja na-anakọta otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼaka ndị ọzọ, ya bụ, site nʼaka ndị ụmụnna ha ndị Izrel, nʼagbanyeghị na ụmụnna ha ndị ahụ bụkwa ụmụ ụmụ Ebraham. 6Ma nwoke a bụ onye na-esiteghị nʼagbụrụ naara otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼaka Ebraham ma gọziekwa ya bụ onye ahụ nke natara nkwa ahụ.

Oziọma

Luk 21:28–33

28Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.” 29Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya. 30Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso. 31Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso. 32“Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 33Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 21 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike