Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 20 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Jenụwarị 2027

Wenezdee · Izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 2 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Fabian, Pope na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Sebastian, Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Hib 7:1–3, 15–17

1Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya. 2Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.” 3O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. 15E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara. 16Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi. 17Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 110:1–4

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” 2Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile. 3Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ. 4Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.”

Oziọma

Mak 3:1–6

1Nʼoge ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere, otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa nʼebe ahụ. 2Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike. 3Ma ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, “Bilie guzoro nʼetiti ebe a.” 4Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: ọ bụ ime ezi ihe ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” Ma ha gbachiri nkịtị. 5O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma. 6Ngwangwa, ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ nʼiwe. Gaa soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi laa ya nʼiyi.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike