Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 13 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Jenụwarị 2027
Wenezdee · Izu nke 1 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 1 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Hilari nke Poitiers, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
14Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu. 15Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile. 16Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham. 17Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile. 18Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.
Abụ Ọma nzaghachi
1Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. 2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. 3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa. 4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. 6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile. 8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, 9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
Oziọma
29Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru. 30Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya. 31Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa. 32Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha. 33Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ. 34Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ. 35Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere. 36Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya. 37Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!” 38Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.” 39Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Hilari nke Poitiers, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike