Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 15 Jenụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Jenụwarị 2027
Fraịdee · Izu nke 1 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 1 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya. 2Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya. 3Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo, “Aṅụrụ m iyi nʼiwe m, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa. 4Nʼihi nʼotu ebe, o nweela ihe o kwuru banyere ụbọchị nke asaa site nʼokwu ndị a: “Chineke zuru ike site nʼọrụ ya niile, nʼụbọchị nke asaa.” 5Ma nʼebe a kwa, e kwuru, “Ha agaghị abanye nʼebe izuike m ma ọlị.” 11Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nʼebe izuike ahụ, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọbụla nke na-agaghị aba nʼihi ịṅomi ekweghị ekwe ha.
Abụ Ọma nzaghachi
3ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị. 4Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere. 6ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha. 7Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile. 8Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.
Oziọma
1Mgbe ụbọchị ole na ole gafesịrị, ọ bataghachiri na Kapanọm. Ndị mmadụ nụrụ na ọ lọghachila. 2Igwe mmadụ zukọtara nʼime ụlọ ahụ nke mere na ohere afọdụghị ọ bụladị nʼọnụ ụzọ. O kwusakwaara ha oziọma. 3Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya. 4Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina. 5Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị.” 6Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu nọdụrụ ala nʼebe ahụ na-eche nʼime obi ha sị, 7“Gịnị mere onye a ji na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị naanị Chineke?” 8Ngwangwa Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-atule okwu a nʼime obi ha. Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị otu a nʼobi unu? 9Olee nke ka mfe: ọ bụ ịgwa onye a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ i sị, ‘Bilie chịrị ute gị jegharịa?’ 10Ma igosi unu na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, 11“Ana m asị gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị.” 12O biliri, chịrị ute ya pụọ nʼihu mmadụ niile. Nke a juru ndị niile nọ nʼebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike